Job 23:6-11 Bible Nso (IGBOB)

6. Ọ̀ bu n'uba ǹke ike-Ya ka O gēkpesom ikpe?É-è; kama Ya onwe-ya gēchem iru.

7. N'ebe ahu ka onye ziri ezi nēso Ya ru uka;Ewe me ka m'b͕apu n'aka Onye-ikpem rue mb͕e ebighi-ebi.

8. Le, m'ga n'iru, ma Ọ nọghi ya;M'ga kwa n'azu, ma adighm-ahuta Ya:

9. M'ga n'aka-ekpe, mb͕e Ọ nālu ọlu, ma adighm-ahu Ya anya:Ọ nēkpuchi Onwe-ya n'aka-nri, m'we ghara ihu Ya.

10. N'ihi na Ọ mawo uzọ m'nāga;Mb͕e Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m'gāputa.

11. Nzọ-ukwu-Ya ka ukwum nējisi ike iso;Uzọ-Ya ka m'debeworo, adighm-ewezuga kwa onwem.

Job 23