Job 22:8-21 Bible Nso (IGBOB)

8. Ma nwoke nke ogwe-aka-ya di ike, ọ bu ya nwe uwa;Onye anāhu iru-ọma nēbi kwa nime ya.

9. I zipuwo ndinyom di-ha nwuru n'aka efu,Anānyaji kwa ogwe-aka nke umu-nb͕ei.

10. N'ihi ya ib͕udu di gi buruburu,Oké egwu mberede nāma kwa gi jijiji,

11. Ma-ọbu ọchichiri, nke i nādighi-ahu anya,Na njubiga miri nēkpuchi gi.

12. Chìneke anọghi n'ebe di elu nke elu-igwe?Le kwa idi-elu kpakpando, na ha di elu!

13. I we si, Gini ka Chineke mara?Ò gēsi n'azu oké ochichiri kpe ikpe?

14. Igwe-oji b͕ara ọchichiri nāburu Ya ebe-nzuzo, Ọ dighi-ahu kwa uzọ;Ọ bu kwa buruburu elu-igwe ka Ọ nējeghari.

15. Ì gēdebe uzọ ochie,Nke ndikom nēme ajọ ihe zọkwasiworo ukwu?

16. Bú ndi apunara, ma mb͕e-ha akērughi,Ndi awusiri ntọ-ala-ha dika osimiri:

17. Ndi nāsi Chineke, Si n'ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi:Ọzọ, Gini ka Onye puru ime ihe nile gēmere ha?

18. Ma Ya onwe-ya mejuru ulo nile ha n'ezi ihe:Ma ndum-ọdu ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ.

19. Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria;Onye nēmeghi ihe ọjọ nāchì kwa ha ọchì:

20. Si, N'ezie ezopuwo ha n'uwa, bú ndi nēbili imegide ayi,Ọku eripiawo kwa ihe-ha fọduru.

21. Biko, mara Ya nke-ọma, we nọ n'udo:Nime ihe ndia ka ọdi-nma gābiakute gi.

Job 22