Job 22:10-13 Bible Nso (IGBOB)

10. N'ihi ya ib͕udu di gi buruburu,Oké egwu mberede nāma kwa gi jijiji,

11. Ma-ọbu ọchichiri, nke i nādighi-ahu anya,Na njubiga miri nēkpuchi gi.

12. Chìneke anọghi n'ebe di elu nke elu-igwe?Le kwa idi-elu kpakpando, na ha di elu!

13. I we si, Gini ka Chineke mara?Ò gēsi n'azu oké ochichiri kpe ikpe?

Job 22