20. Ka anya-ya abua hu nbibi-ya,Ya ṅua ufọdu nime ọnuma nke Onye Nke puru ime ihe nile.
21. N'ihi na ìhe ulo-ya gēsi aṅa tọ ya utọ mb͕e ọ nwusiri,Mb͕e ekepusiri ọnu-ọgugu ọnwa-ya nile n'etiti?
22. Ọ̀ di onye gēzí Chineke ọmuma-ihe? Ebe Ya onwe-ya nēkpe ndi di elu ikpe.
23. Otù onye nānwu n'ume-ya zuru okè,Mb͕e ọ nānọzu jū na n'udo:
24. Ihe-ya nile juputara na miri-ara-ehi,Umi ọkpukpu-ya nile edewo kwa miri.
25. Onye ọzọ nānwu n'ilu nkpuru-obi,Ọ dighi kwa mb͕e o riri ezi ihe.
26. Ha abua n'otù, n'elu ájá ka ha nēdinakọ,Ikpuru nēkpuchi kwa ha.