Job 21:18-33 Bible Nso (IGBOB)

18. Ùb͕ò ole ka ha di ka ahihia-ọka n'iru ifufe,Na dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēzupu dika onye-ori?

19. Unu nāsi, Chineke nēzobere umu-ya ajọ ihe-ya.Ka Ọ kwughachi onye ahu n'onwe-ya, ka o we mara ya.

20. Ka anya-ya abua hu nbibi-ya,Ya ṅua ufọdu nime ọnuma nke Onye Nke puru ime ihe nile.

21. N'ihi na ìhe ulo-ya gēsi aṅa tọ ya utọ mb͕e ọ nwusiri,Mb͕e ekepusiri ọnu-ọgugu ọnwa-ya nile n'etiti?

22. Ọ̀ di onye gēzí Chineke ọmuma-ihe? Ebe Ya onwe-ya nēkpe ndi di elu ikpe.

23. Otù onye nānwu n'ume-ya zuru okè,Mb͕e ọ nānọzu jū na n'udo:

24. Ihe-ya nile juputara na miri-ara-ehi,Umi ọkpukpu-ya nile edewo kwa miri.

25. Onye ọzọ nānwu n'ilu nkpuru-obi,Ọ dighi kwa mb͕e o riri ezi ihe.

26. Ha abua n'otù, n'elu ájá ka ha nēdinakọ,Ikpuru nēkpuchi kwa ha.

27. Le, amawom èchìchè-unu,Na nzube nile unu ji megidem ihe-ike.

28. N'ihi na unu nāsi, Òle ebe ulo onye-isi di?Òle ebe ulo-ikwū nke ebe-obibi ndi nēmebi iwu di kwa?

29. Ùnu ajughi ndi nāgabiga n'uzọ?Ùnu amaghi kwa ihe-iriba-ama-ha?

30. Na ọ bu rue ubọchi nhuju-anya ka anēb͕ochi onye ọjọ?Na ọ bu rue ubọchi ọnuma ka anēdupu ha?

31. Ònye gēgosi uzọ-ya n'iru ya?Ihe ahu kwa nke o mere, ònye gākwughachi ya?

32. Ma agēburu onye ahu rue ílì,Ọ gēche kwa nche n'elu obo-ya.

33. Ọkpurukpu-àjà nke ndagwurugwu gātọ ya utọ,Madu nile gādọrọ onwe-ha iso ya n'azu,Dika ndi anāpughi igu ọnu buru ya uzọ.

Job 21