16. Le, ọ bughi n'aka-ha ka ọdi-nma-ha di:Ndum-ọdu nke ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ.
17. Ùb͕ò ole ka anēmenyu oriọna ndi nēmebi iwu?Ùb͕ò ole ka nhuju-anya-ha nābiakwasi ha?Ùb͕ò ole ka Chineke nēkesa ihe-nb͕u n'iwe-Ya?
18. Ùb͕ò ole ka ha di ka ahihia-ọka n'iru ifufe,Na dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēzupu dika onye-ori?
19. Unu nāsi, Chineke nēzobere umu-ya ajọ ihe-ya.Ka Ọ kwughachi onye ahu n'onwe-ya, ka o we mara ya.
20. Ka anya-ya abua hu nbibi-ya,Ya ṅua ufọdu nime ọnuma nke Onye Nke puru ime ihe nile.
21. N'ihi na ìhe ulo-ya gēsi aṅa tọ ya utọ mb͕e ọ nwusiri,Mb͕e ekepusiri ọnu-ọgugu ọnwa-ya nile n'etiti?
22. Ọ̀ di onye gēzí Chineke ọmuma-ihe? Ebe Ya onwe-ya nēkpe ndi di elu ikpe.
23. Otù onye nānwu n'ume-ya zuru okè,Mb͕e ọ nānọzu jū na n'udo:
24. Ihe-ya nile juputara na miri-ara-ehi,Umi ọkpukpu-ya nile edewo kwa miri.
25. Onye ọzọ nānwu n'ilu nkpuru-obi,Ọ dighi kwa mb͕e o riri ezi ihe.
26. Ha abua n'otù, n'elu ájá ka ha nēdinakọ,Ikpuru nēkpuchi kwa ha.
27. Le, amawom èchìchè-unu,Na nzube nile unu ji megidem ihe-ike.
28. N'ihi na unu nāsi, Òle ebe ulo onye-isi di?Òle ebe ulo-ikwū nke ebe-obibi ndi nēmebi iwu di kwa?