Job 20:8-24 Bible Nso (IGBOB)

8. Dika nrọ ka ọ gēfelaga, agaghi-achọta kwa ya:Agēme kwa ka o fepu dika ọhù abali.

9. Anya ahuwo ya, ma ọ gaghi-ahu kwa ya ọzọ;Ọnọdu-ya agaghi-ekiri kwa ya ọzọ.

10. Umu-ya gāchọ iru-oma ndi-ob͕eye,Aka-ya abua gēnyeghachi kwa àkù-ya.

11. Ọkpukpu-ya nile juputara n'ume okorọbia-ya,Ma o gēso ya dina n'elu ájá.

12. Ọ buru na ihe ọjọ atọ utọ n'ọnu-ya,Ọ buru na o zobe ya n'okpuru ire-ya;

13. Ọ buru na o nwe ọmiko n'aru ya, we ghara irapu ya,Kama ọ nēb͕ochi ya nokpo-ọnu-ya;

14. Nri-ya nke di na ngiri-afọ-ya ab͕anwewo,Ọ bu òlùlù aju-ala n'ime-ya.

15. O lodawo àkù, we b͕oputa ya:Chineke gēsi n'afọ-ya napu ya àkù ahu.

16. Nsi aju-ala ka ọ gāmiri:Ire agwọ gēb͕u ya.

17. Ọ gaghi-ele miri-iyi anya,Bú osimiri miri-iyi nke manu-aṅu na miri-ara-ehi raru araru.

18. Ọ nēnyeghachi ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inwe, ọ gaghi-eleda ya;Dika àkù nke ihe-nb͕anwe-ya si di, ọ gaghi-aṅuri ọṅu otú a.

19. N'ihi na ọ zopiawo ndi-ob͕eye, rapu kwa ha;Ọ napuwo ulo n'ike, ọ gaghi-ewu kwa ya.

20. N'ihi na ọ dighi-ama udo n'afọ-ya,Ya mere ọ gaghi-eji ihe-ya anāchọsi ike wepuga onwe-ya.

21. Ọ dighi ihe fọduru nke ọ nērighi;N'ihi ya ọdi-nma-ya agaghi-adi ike.

22. N'ojuju nke ozùzù-ya nkpà nākpà ya:Aka onye ọ bula nke nọ n'ọnọdu ọjọ gābiakwasi ya.

23. Ka o rue, n'iriju afọ-ya,Na Chineke gēzitere ya idi-ọku nke iwe-Ya,Na Ọ gēme kwa ka o zokwasi ya dika miri-ozuzo nime nri-ya.

24. Ọ gēsi n'ihe-ekike-agha ígwè b͕alaga,Uta ọla gāb͕apue ya.

Job 20