4. Ì mawo nka site na mb͕e ochie,Site na mb͕e edoro madu n'elu uwa,
5. Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu,Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya?
6. Ọ buru na nbuli-ya arigorue elu-igwe,Isi-ya ewe metu igwe-oji;
7. Dika ǹsí-ya ka ọ gāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi:Ndi huworo ya gāsi, Òle ebe ọ nọ?
8. Dika nrọ ka ọ gēfelaga, agaghi-achọta kwa ya:Agēme kwa ka o fepu dika ọhù abali.
9. Anya ahuwo ya, ma ọ gaghi-ahu kwa ya ọzọ;Ọnọdu-ya agaghi-ekiri kwa ya ọzọ.
10. Umu-ya gāchọ iru-oma ndi-ob͕eye,Aka-ya abua gēnyeghachi kwa àkù-ya.
11. Ọkpukpu-ya nile juputara n'ume okorọbia-ya,Ma o gēso ya dina n'elu ájá.
12. Ọ buru na ihe ọjọ atọ utọ n'ọnu-ya,Ọ buru na o zobe ya n'okpuru ire-ya;