17. Ọ gaghi-ele miri-iyi anya,Bú osimiri miri-iyi nke manu-aṅu na miri-ara-ehi raru araru.
18. Ọ nēnyeghachi ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inwe, ọ gaghi-eleda ya;Dika àkù nke ihe-nb͕anwe-ya si di, ọ gaghi-aṅuri ọṅu otú a.
19. N'ihi na ọ zopiawo ndi-ob͕eye, rapu kwa ha;Ọ napuwo ulo n'ike, ọ gaghi-ewu kwa ya.
20. N'ihi na ọ dighi-ama udo n'afọ-ya,Ya mere ọ gaghi-eji ihe-ya anāchọsi ike wepuga onwe-ya.
21. Ọ dighi ihe fọduru nke ọ nērighi;N'ihi ya ọdi-nma-ya agaghi-adi ike.
22. N'ojuju nke ozùzù-ya nkpà nākpà ya:Aka onye ọ bula nke nọ n'ọnọdu ọjọ gābiakwasi ya.