Job 20:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Zofa, bú onye Neama, we za, si,

2. N'ihi nka ka èchìchèm nāzaghachim,Ọbuná n'ihi ime-ngwam nke di nimem.

3. Anuwom ọdidọ-aka-na-nti nke nētiyem n'ọnọdu-ihere,Mọ nke nghọtam nāzakwam.

4. Ì mawo nka site na mb͕e ochie,Site na mb͕e edoro madu n'elu uwa,

5. Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu,Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya?

6. Ọ buru na nbuli-ya arigorue elu-igwe,Isi-ya ewe metu igwe-oji;

Job 20