6. Maranu ub͕u a na Chineke merem ka m'bagọ ab͕agọ,Na O siwo-kwa-ram ọnyà-Ya buruburu.
7. Le, anameti nkpu, si, Ihe-ike! ma adighi-azam:Anametiku Chineke, ma ikpé adighi.
8. Ọ b͕achiwo okporo-uzọm, m'gaghi-agabiga kwa,N'uzọm nile ka Ọ nēdokwasi kwa ọchichiri.
9. O yipuwo nsọpurum n'arum dika uwe,We wezuga okpu-eze n'isim.
10. Ọ nākwatum buruburu, m'we la:O we ropu olile-anyam dika osisi.
11. O me ka iwe-Ya di ọku imegidem,Ọ guaram Onwe-ya dika ndi nēmegide Ya.
12. Usu-Ya nile ndi nāpunara madu ihe nābiakọta, tulie uzọ-ha imegidem,Ma kwa ulo-ikwū-ha buruburu ulo-ikwūm.
13. O mewo ka umu-nnem nọpurum n'ebe di anya,Ndi maworom we ghọ nání ndi ala ọzọ n'ebe m'nọ.
14. Ndi-ab͕ata-obim akwusiwo,Ndi m'mara echezọwokwam.
15. Ndi nọ n'ulom dika ọbìa na ndi-orum nwayi nāgum n'onye ala ọzọ:Onye anāmataghi ka m'ghọworo n'anya-ha.
16. Akpọwom arùm òkù, ma ọ dighi-azam,Anameji ọnum riọ ya aririọ-amara.
17. Iku-umem aghọwo iku-ume onye nābughi di-ya n'ebe nwunyem nọ,Ariọwokwam umu afọ nnem aririọ-amara.
18. Ọbuná umu nāṅu ara ajuwom;Ọ buru na ebiliem, ha we nēkwugidem.
19. Ndi-ìzum nile nākpọm ihe-árú:Ndi ahu m'huru n'anya echighariwo imegidem.
20. Ọkpukpum nārapara n'akpukpọ-arum na n'anu-arum,M'we were akpukpọ ezém wepuga onwem.
21. Merenum amara, merenum amara, unu onwe-unu, bú ndi-eyìm;N'ihi na aka Chineke emetuwom n'aru.
22. N'ìhi gini ka unu nāchum dika Chineke?N'ìhi gini ka anu-arum adighi-eju unu afọ?
23. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ede okwum nile n'akwukwọ ub͕u a!Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na akà ha n'akwukwo!
24. Ma asi na eji pen ígwè na òpùKa ha n'oké nkume rue mb͕e ebighi-ebi!