5. Ọ buru na ọ bu ezie na ọ bu imegidem ka unu nēme onwe-unu uku,Ọ buru kwa na unu ewere ita-utam som ru uka:
6. Maranu ub͕u a na Chineke merem ka m'bagọ ab͕agọ,Na O siwo-kwa-ram ọnyà-Ya buruburu.
7. Le, anameti nkpu, si, Ihe-ike! ma adighi-azam:Anametiku Chineke, ma ikpé adighi.
8. Ọ b͕achiwo okporo-uzọm, m'gaghi-agabiga kwa,N'uzọm nile ka Ọ nēdokwasi kwa ọchichiri.
9. O yipuwo nsọpurum n'arum dika uwe,We wezuga okpu-eze n'isim.
10. Ọ nākwatum buruburu, m'we la:O we ropu olile-anyam dika osisi.
11. O me ka iwe-Ya di ọku imegidem,Ọ guaram Onwe-ya dika ndi nēmegide Ya.