Job 19:25-28 Bible Nso (IGBOB)

25. Ma mu onwem amawo na Onye-nb͕aputam di ndu,Na O gēbili kwa ọtọ n'elu ájá n'ikpe-azu:

26. Mb͕e emebisi-kwa-ra akpukpọ-arum nka,Ọ bu na m'gēsi n'anu-arum hu Chineke:

27. Onye mu onwem gāhuru onwem,Anyam abua gāhu kwa Ya, Ọ bughi kwa onye ala ọzọ.Akurum abua agwusiwo n'imem.

28. Ọ buru na unu asi, Àyi gēsi aṅa chu ya?Ma achọtawo nkpọrọgwu okwu nimem;

Job 19