8. N'ihi na eji ukwu-ya abua ziga ya n'ub͕u eji eb͕u anu,Ọ nējeghari kwa n'elu ihe-ntuhi.
9. Ib͕udu gādakwasi ya n'ikiri-ukwu,Ọnyà gāma ya.
10. Ezobeworo ya udọ̀ n'ala,Na ihe iji nwude ya n'elu uzọ.
11. Ihe-egwu emewo ka ọ tua egwu nke-uku buruburu,Ha we chugharia ya n'ukwu-ya.
12. Agu ganāgu ume-ya,Edoziwo kwa nhuju-anya n'akuku-ya.