4. Ọ nādọka onwe-ya n'iwe-ya.Àgārapu uwa n'ihi gi?Ma-ọbu àgākwapu oké nkume n'ọnọdu-ya?
5. Ọzọ, agēmenyu ìhè nke ndi nēmebi iwu,Ọ dighi kwa ire-ọku nke ọku-ya gēnwu.
6. Ìhè aghọwo ọchichiri n'ulo-ikwū-ya,Agēmenyu kwa oriọna-ya n'elu ya.
7. Agākpagide nzọ-ukwu nile nke ume-ya,Ndum-ọdu-ya gātuda kwa ya.
8. N'ihi na eji ukwu-ya abua ziga ya n'ub͕u eji eb͕u anu,Ọ nējeghari kwa n'elu ihe-ntuhi.
9. Ib͕udu gādakwasi ya n'ikiri-ukwu,Ọnyà gāma ya.