17. Ncheta-ya alawo n'iyì pua n'uwa,Ọ dighi kwa aha ọ gēnwe n'èzí.
18. Agākwapu ya n'ihè ba n'ọchichiri,Agēme kwa ka o si n'elu-uwa dum madu bi waghari.
19. Ọ dighi umu, ọ dighi kwa umu umu, ọ gēnwe n'etiti ndi-ya,Ọ dighi kwa onye fọduru n'ọnọdu-ọbìa-ya nile.
20. Ibobo bayere ubọchi-ya anwuwo ndi bi n'akuku Ọdida-anyanwu n'aru,Ndi bi n'akuku Iru-anyanwu atuwo kwa oké ujọ.