13. Ọ gēripia ihe di n'akpukpọ-aru-ya,Ọkpara ọnwu gēripia ihe nile di ya n'aru.
14. Agādọpusi ya ike n'ulo-ikwū-ya, bú ihe-ntukwasi-obi-ya;Agēme ka ọ zọrọ ukwu gakuru eze nke ihe-egwu nile.
15. Ihe nābughi nke ya gēbi n'ulo-ikwū-ya:Agēfesa brimstone n'elu ebe-obibi-ya.
16. Nkpọrọgwu-ya gākpọ nku n'okpuru,Agēbipu kwa alaka-ya n'elu.
17. Ncheta-ya alawo n'iyì pua n'uwa,Ọ dighi kwa aha ọ gēnwe n'èzí.
18. Agākwapu ya n'ihè ba n'ọchichiri,Agēme kwa ka o si n'elu-uwa dum madu bi waghari.