Job 17:9-15 Bible Nso (IGBOB)

9. Ma onye ezi omume gējisi ike n'iso uzọ-ya,Onye nke aka-ya abua di ọcha ganāga n'iru n'iru n'inwe ume.

10. Ma otú ọ di, biko, unu nile chigharia, bia:Ma m'gaghi-achọta onye mara ihe n'etiti unu.

11. Ubọchim nile agabigawo, emebiwo nzubem nile,Bú ihe-nnweta nke obim.

12. Ha nēdo abali n'ọnọdu ehihie:Ha nāsi, Ìhè di nso iru ọchichiri.

13. Ọ buru na elem anya ala-mọ na ọ gābu ụlọm;Ọ buru na ab͕asawom utem n'ọchichiri;

14. Ọ buru na akpọwom olùlù òkù, si, Nnam ka i bu;Kpọ kwa ikpuru òkù, si, Nnem na nwa-nnem nwayi ka i bu;

15. Òle ebe kwa ka olile-anyam di ub͕u a?Olile-anyam kwa, ònye gēkiri ya?

Job 17