Job 17:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Emebiwo mọm, emewo ka ubọchim gwusia,Ílì dirim.

2. N'ezie ikwa-emò diyerem,Anyam nānọ kwa ọnọdu-abali n'ikpasu-obi-ilu nile ha.

3. Biko, do ihe-ibe, burum onye-mbe n'ebe Gi onwe-gi nọ;Ònye ka ọ bu, bú onye gānaram n'aka?

4. N'ihi na I zopuwo obi-ha n'inwe ezi uche:N'ihi ya I gaghi-ebuli ha elu.

5. Onye nēgosi ndi-eyì-ya inara òkè,Ọbuná anya umu-ya gādala n'isi.

6. Ọzọ, O guzowom dika ilu nke ndi nile di iche iche;Onye ha nābusa ọnu-miri n'iru-ya ka m'ghọwo-kwa-ra.

7. Anyam we nāhu inyoghi-inyoghi site na nkpasu-iwe,Ihe dim n'aru di ka onyinyo, ha nile.

8. Ibobo bayere nka gānwu ndi ziri ezi n'aru,Onye nēmeghi ihe ọjọ gākpọte kwa onwe-ya imegide onye emeruru emeru.

9. Ma onye ezi omume gējisi ike n'iso uzọ-ya,Onye nke aka-ya abua di ọcha ganāga n'iru n'iru n'inwe ume.

10. Ma otú ọ di, biko, unu nile chigharia, bia:Ma m'gaghi-achọta onye mara ihe n'etiti unu.

11. Ubọchim nile agabigawo, emebiwo nzubem nile,Bú ihe-nnweta nke obim.

Job 17