5. M'gēwere ọnum b͕a unu ume,Nmeghari eb͕ub͕ere-ọnum gēb͕ochi kwa ihe-nb͕u-unu.
6. Ọ buru na ekwuem, adighi-eb͕ochi ihe-nb͕um:Ma ọ buru na arapum, gini gēsi n'arum la?
7. Otú ọ di, ub͕u a O mewo ka ike gwum:I mewo ka nzukọm nile ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu.
8. I we jisiem ike, ọ ghọwo ihe-àmà megidem:Ọtita-arum we nēbili imegidem, Ọ nāzam n'iru.
9. Iwe-ya adọkawom O we kpọm asì;Ọ takwasiwom ikekere ezé-Ya:Onye-nkpab͕um nāchichapu anya-Ya n'arum.