Job 16:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Job we za, si,

2. Anuwom ọtutu ihe dika ihe ndia:Ndi-nkasi-obi nēweta ọnọdu ọjọ ka unu nile bu.

3. Òkwu nke bu nání ifufe gēnwe ọgwugwu?Ma-ọbu gini nēme gi ka i di irè, na i nāza okwu?

4. Ka mu onwem kwu kwa okwu dika unu;Ọ buru na nkpuru-obi-unu adi n'ọnọdu nkpuru-obim,M'gēnwe ike ijikọta okwu imegide unu,Na ifufe isim imegide unu.

5. M'gēwere ọnum b͕a unu ume,Nmeghari eb͕ub͕ere-ọnum gēb͕ochi kwa ihe-nb͕u-unu.

6. Ọ buru na ekwuem, adighi-eb͕ochi ihe-nb͕um:Ma ọ buru na arapum, gini gēsi n'arum la?

7. Otú ọ di, ub͕u a O mewo ka ike gwum:I mewo ka nzukọm nile ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu.

8. I we jisiem ike, ọ ghọwo ihe-àmà megidem:Ọtita-arum we nēbili imegidem, Ọ nāzam n'iru.

9. Iwe-ya adọkawom O we kpọm asì;Ọ takwasiwom ikekere ezé-Ya:Onye-nkpab͕um nāchichapu anya-Ya n'arum.

10. Ha asaghepuwo ọnu-ha n'arum,Were ita-uta tiem aka na ǹtì:Ha nāchikọzu onwe-ha n'otù imegidem.

Job 16