Job 14:7-11 Bible Nso (IGBOB)

7. N'ihi na olile-anya diri osisi na ọ gēpute ọzọ, ma eb͕utue ya,Na ome-ya agaghi-akwusi kwa.

8. Ọ buru na nkpọrọgwu-ya eme ochie n'ala,Ogwe-ya anwu kwa n'ájá;

9. Site n'ísì miri ọ gāma akwukwọ,Wa kwa alaka dika ihe akuru aku.

10. Ma onye di ike gānwu, ike gāgwu kwa ya:Madu we kubìe ume, òle ebe ọ nọ kwa?

11. Miri esiwo n'oké osimiri la,Osimiri we tasia, takọrọ;

Job 14