5. Ebe ihe akara àkà ka ubọchi-ya nile bu, ọnu-ọgugu nke ọnwa-ya nile di n'aka-Gi,I mewo ókè-ya, ọ gaghi-agabiga kwa ya;
6. Lepu ya anya, ka o we kwusi,Rue mb͕e ubochi-ya gātọ ya utọ, dika onye egoro ọlu.
7. N'ihi na olile-anya diri osisi na ọ gēpute ọzọ, ma eb͕utue ya,Na ome-ya agaghi-akwusi kwa.
8. Ọ buru na nkpọrọgwu-ya eme ochie n'ala,Ogwe-ya anwu kwa n'ájá;