Job 14:5-15 Bible Nso (IGBOB)

5. Ebe ihe akara àkà ka ubọchi-ya nile bu, ọnu-ọgugu nke ọnwa-ya nile di n'aka-Gi,I mewo ókè-ya, ọ gaghi-agabiga kwa ya;

6. Lepu ya anya, ka o we kwusi,Rue mb͕e ubochi-ya gātọ ya utọ, dika onye egoro ọlu.

7. N'ihi na olile-anya diri osisi na ọ gēpute ọzọ, ma eb͕utue ya,Na ome-ya agaghi-akwusi kwa.

8. Ọ buru na nkpọrọgwu-ya eme ochie n'ala,Ogwe-ya anwu kwa n'ájá;

9. Site n'ísì miri ọ gāma akwukwọ,Wa kwa alaka dika ihe akuru aku.

10. Ma onye di ike gānwu, ike gāgwu kwa ya:Madu we kubìe ume, òle ebe ọ nọ kwa?

11. Miri esiwo n'oké osimiri la,Osimiri we tasia, takọrọ;

12. Otú a madu edinawo, ọ dighi-ebili kwa:Rue mb͕e elu-igwe nādighi, ha agaghi-eteta,Agaghi-akpọte kwa ha n'ura-ha.

13. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I zobem n'ala-mọ,Ma asi na I debem na nzuzo, rue mb͕e iwe-Gi laghachiri,Ma asi na I kparam ókè, we chetam!

14. Ọ buru na madu anwua, ọ̀ gadi ndu ọzọ?Ubọchi nile nke obubu-agham ka m'gēche,Rue mb͕e nb͕anwem gābia.

15. I gākpọ òkù, mu onwem gāza kwa Gi:Agu ọlu aka-Gi gāgu Gi.

Job 14