Job 14:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Madu nke nwayi muru,Ubọchi-ndu-ya di nkpunkpu, afọ ejuwo kwa ya n'ahuhu.

2. Dika okoko-osisi ka ọ putaworo, ewe nēbipu ya:O we nāb͕alaga dika onyinyo, ọ dighi-eguzo kwa.

3. Ọ̀ bu kwa n'aru onye a ka I megheworo anya-Gi,Me ka m'so Gi ba n'ikpé?

4. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ihe ọcha gāputa n'ihe ruru árú! ọ dighi otù ihe ọcha gāputa na ya.

5. Ebe ihe akara àkà ka ubọchi-ya nile bu, ọnu-ọgugu nke ọnwa-ya nile di n'aka-Gi,I mewo ókè-ya, ọ gaghi-agabiga kwa ya;

6. Lepu ya anya, ka o we kwusi,Rue mb͕e ubochi-ya gātọ ya utọ, dika onye egoro ọlu.

7. N'ihi na olile-anya diri osisi na ọ gēpute ọzọ, ma eb͕utue ya,Na ome-ya agaghi-akwusi kwa.

8. Ọ buru na nkpọrọgwu-ya eme ochie n'ala,Ogwe-ya anwu kwa n'ájá;

9. Site n'ísì miri ọ gāma akwukwọ,Wa kwa alaka dika ihe akuru aku.

Job 14