Job 12:8-15 Bible Nso (IGBOB)

8. Ma-ọbu gi na uwa kparita uka, o gēzí kwa gi ihe;Azù nke oké osimiri gākọ-kwa-ra gi.

9. Ọ̀ bu onye nāmaghi n'ihe ndia nile,Na aka Jehova emewo nka?

10. Onye nkpuru-obi nke ihe ọ bula di ndu di n'aka-Ya,Ya na mọ nke anu-aru nile nke madu.

11. Nti, ọ̀ dighi-anwa okwu?Okpo-ọnu kwa, ọ̀ dighi-edeturu onwe-ya ihe-oriri-ya?

12. Nime ndi kara nká ka amam-ihe di,N'ubọchi ndu di ogologo ka nghọta di kwa.

13. N'aka-Ya ka amam-ihe na idi-ike di;Ọ nwere ndum-ọdu na nghọta.

14. Le, Ọ nākwada ihe, agaghi-ewu kwa ya ọzọ;Ọ nēmechibido madu uzọ, agaghi-emeghe kwa ya.

15. Le, Ọ nēb͕ochi miri, ha takọrọ;Ọzọ, ọ nēzipu ha, ha we kpùe uwa iru.

Job 12