Job 12:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Job we za, si,

2. N'ezie unu onwe-unu bu ndi bu ihe,Unu na amam-ihe gānwukọ n'otù.

3. Enwe-kwa-ram obi dika unu;Mu onwem abughi onye dara ada kari unu:Ma ònye ka ọ bu nke ihe dika ndia nādighi n'aka?

4. Onye bu ihe-ọchì nke madu-ibe-ya ka m'bu,Bú onye nākpọku Chineke, O we za ya:Ihe-ọchì ka onye ezi omume nke zuru okè bu.

5. Nleda diri ọdida n'èchìchè onye nọ jū;Edoziwo ya nye ndi ukwu-ha nāb͕uchapu ab͕uchapu.

Job 12