1. Job we za, si,
2. N'ezie unu onwe-unu bu ndi bu ihe,Unu na amam-ihe gānwukọ n'otù.
3. Enwe-kwa-ram obi dika unu;Mu onwem abughi onye dara ada kari unu:Ma ònye ka ọ bu nke ihe dika ndia nādighi n'aka?
4. Onye bu ihe-ọchì nke madu-ibe-ya ka m'bu,Bú onye nākpọku Chineke, O we za ya:Ihe-ọchì ka onye ezi omume nke zuru okè bu.
5. Nleda diri ọdida n'èchìchè onye nọ jū;Edoziwo ya nye ndi ukwu-ha nāb͕uchapu ab͕uchapu.
6. Ulo-ikwū nile nke ndi nāpunara madu ihe di n'udo,Ntukwasi-obi di-kwa-ra ndi nākpasu Chineke iwe;Bú onye ọ bula nke wetaworo chi-ya n'aka-ya.
7. Ma otú ọ di, biko, jua anumanu, ha gēzí kwa gi ihe,Na anu-ufe nke elu-igwe, ha gēgosi kwa gi:
8. Ma-ọbu gi na uwa kparita uka, o gēzí kwa gi ihe;Azù nke oké osimiri gākọ-kwa-ra gi.
9. Ọ̀ bu onye nāmaghi n'ihe ndia nile,Na aka Jehova emewo nka?
10. Onye nkpuru-obi nke ihe ọ bula di ndu di n'aka-Ya,Ya na mọ nke anu-aru nile nke madu.
11. Nti, ọ̀ dighi-anwa okwu?Okpo-ọnu kwa, ọ̀ dighi-edeturu onwe-ya ihe-oriri-ya?
12. Nime ndi kara nká ka amam-ihe di,N'ubọchi ndu di ogologo ka nghọta di kwa.
13. N'aka-Ya ka amam-ihe na idi-ike di;Ọ nwere ndum-ọdu na nghọta.
14. Le, Ọ nākwada ihe, agaghi-ewu kwa ya ọzọ;Ọ nēmechibido madu uzọ, agaghi-emeghe kwa ya.