1. Zofa, bú onye Neama, we za, si,
2. Àgaghi-aza ọtutu okwu?Àgāgu kwa onye eb͕ub͕ere-ọnu n'onye ezi omume?
3. Ekwukwu-Gi nile nēme ka madu b͕a nkiti;I we chìa ọchì, ma ọ dighi onye nēme ka ihere me gi.
4. I we si, Nmutam di ọcha,M'di kwa ọcha n'anya-Gi.