Job 10:4-19 Bible Nso (IGBOB)

4. Ọ̀ bu anya anu-aru ka I nwere,Ma-ọbu na I nāhu dika madu si ahu?

5. Ọ̀ bu dika ubọchi madu si di ka ubọchi-Gi di?Ma-ọbu arọ-Gi, hà di ka ubọchi madu,

6. Na I nāchọ ajọ omumem,Nāju kwa ase nmehiem?

7. Ọ bu ezie na I mara na adighm-emebi iwu;Ọ dighi kwa onye ọ bula nānaputa n'aka-Gi.

8. Aka-Gi dozirim, we kpuamKa m'buru otù buruburu; ma I nēlodam.

9. Biko, cheta na dika urọ ka I kpuworom;Ì gēme kwa ka m'laghachi n'ájá?

10. Ọ̀ bughi dika miri-ara ka I nāwusim,Me ka m'raru araru dika cheese?

11. Akpukpọ-aru na anu-aru ka I yikwasirim,Were kwa ọkpukpu na akwara kpam dika ákwà.

12. Ndu na ebere ka I meworo ka m'nwe,Nlekọta-gi edebewo kwa mọm.

13. Ma I zoro ihe ndia n'obi-Gi;Amawom na nka di n'aka-Gi:

14. Ọ buru na emehiewom, I nēlezikwam anya,I gaghi-agupukwam n'ajọ omumem.

15. Ọ buru na emebiwom iwu, ahuhu dirim;Ọ buru kwa na abum onye ezi omume, m'gaghi-eweli isim elu;Ebe nlelìm juworom afọ,Ya na ilekwasi nwedam anya.

16. Ọ buru kwa na isim ewelie onwe-ya n'elu, dika ọdum nke nāb͕ọ uja ka I nāchu ntám:I we laghachi gosi Onwe-gi onye di ebube megidem.

17. I nēme ka ndi-àmà-Gi di ọhu n'irum,Nēme kwa ka nkpasu-iwe-Gi ba uba n'ebe m'nọ;Nb͕anwe na usu-ndi-agha di n'ebe m'nọ.

18. N'ìhi gini kwa ka I ji me ka m'si n'àkpà-nwa puta?M'gēkubìwori ume, ọ dighi kwa anya gāhum.

19. Dika agāsi na ọ dighi mb͕e m'nọ, otú a ka m'gādi;Site n'afọ nnem rue ílì ka agēbum.

Job 10