Job 10:16-21 Bible Nso (IGBOB)

16. Ọ buru kwa na isim ewelie onwe-ya n'elu, dika ọdum nke nāb͕ọ uja ka I nāchu ntám:I we laghachi gosi Onwe-gi onye di ebube megidem.

17. I nēme ka ndi-àmà-Gi di ọhu n'irum,Nēme kwa ka nkpasu-iwe-Gi ba uba n'ebe m'nọ;Nb͕anwe na usu-ndi-agha di n'ebe m'nọ.

18. N'ìhi gini kwa ka I ji me ka m'si n'àkpà-nwa puta?M'gēkubìwori ume, ọ dighi kwa anya gāhum.

19. Dika agāsi na ọ dighi mb͕e m'nọ, otú a ka m'gādi;Site n'afọ nnem rue ílì ka agēbum.

20. Ùbọchim adighi ole-na-ole? rapu kwa,Dopu Onwe-gi n'ebe m'nọ, ka m'we b͕asa irum nwantī,

21. Tutu alam, ghara kwa ilaghachi,Rue ala ọchichiri, na onyinyo ọnwu;

Job 10