Job 10:12-18 Bible Nso (IGBOB)

12. Ndu na ebere ka I meworo ka m'nwe,Nlekọta-gi edebewo kwa mọm.

13. Ma I zoro ihe ndia n'obi-Gi;Amawom na nka di n'aka-Gi:

14. Ọ buru na emehiewom, I nēlezikwam anya,I gaghi-agupukwam n'ajọ omumem.

15. Ọ buru na emebiwom iwu, ahuhu dirim;Ọ buru kwa na abum onye ezi omume, m'gaghi-eweli isim elu;Ebe nlelìm juworom afọ,Ya na ilekwasi nwedam anya.

16. Ọ buru kwa na isim ewelie onwe-ya n'elu, dika ọdum nke nāb͕ọ uja ka I nāchu ntám:I we laghachi gosi Onwe-gi onye di ebube megidem.

17. I nēme ka ndi-àmà-Gi di ọhu n'irum,Nēme kwa ka nkpasu-iwe-Gi ba uba n'ebe m'nọ;Nb͕anwe na usu-ndi-agha di n'ebe m'nọ.

18. N'ìhi gini kwa ka I ji me ka m'si n'àkpà-nwa puta?M'gēkubìwori ume, ọ dighi kwa anya gāhum.

Job 10