1. Ike ndum agwuwo nkpuru-obim;Ka m'rapuru onwem ntamum;Ka m'kwue okwu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.
2. M'gāsi Chineke, Amalam ikpe;Me ka m'mara ihe kpatara I ji som se okwu.
3. Ọ̀ di Gi nma ka I meb͕ue nmeb͕u,Ka I ju ndọb͕u-n'ọlu nke ọbu-aka-Gi abua,We mukwasi ìhè na ndum-ọdu ndi nēmebi iwu?
4. Ọ̀ bu anya anu-aru ka I nwere,Ma-ọbu na I nāhu dika madu si ahu?
5. Ọ̀ bu dika ubọchi madu si di ka ubọchi-Gi di?Ma-ọbu arọ-Gi, hà di ka ubọchi madu,
6. Na I nāchọ ajọ omumem,Nāju kwa ase nmehiem?
7. Ọ bu ezie na I mara na adighm-emebi iwu;Ọ dighi kwa onye ọ bula nānaputa n'aka-Gi.
8. Aka-Gi dozirim, we kpuamKa m'buru otù buruburu; ma I nēlodam.
9. Biko, cheta na dika urọ ka I kpuworom;Ì gēme kwa ka m'laghachi n'ájá?
10. Ọ̀ bughi dika miri-ara ka I nāwusim,Me ka m'raru araru dika cheese?
11. Akpukpọ-aru na anu-aru ka I yikwasirim,Were kwa ọkpukpu na akwara kpam dika ákwà.
12. Ndu na ebere ka I meworo ka m'nwe,Nlekọta-gi edebewo kwa mọm.
13. Ma I zoro ihe ndia n'obi-Gi;Amawom na nka di n'aka-Gi: