2. Ewe muara ya umu-ndikom asa na umu-ndinyom atọ.
3. Ihe-nnweta-ya di nnù ewu na aturu iri-na-asa na ọgu iri, na nnù camel asa na ọgu iri, na nnù ehi abua na ọgu iri ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu na ọgu ise, na ndi-orù bara uba nke-uku; nwoke ahu we di uku kari umu Iru-anyanwu nile.
4. Ma umu-ya ndikom jere me ọṅuṅu-manya-vine n'ulo nwoke ọ bula nime ha n'ubọchi-ya; ha zì-kwa-ra kpọ umu-nne-ha ndinyom atọ iso ha rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu.
5. O rue, mb͕e ubọchi nile nke ọṅuṅu-manya-vine-ha gasiri buruburu, na Job zìri do ha nsọ, o we bilie n'isi-ututu, sure àjà-nsure-ọku, dika ọnu-ọgugu ha nile si di: n'ihi na Job siri, Eleghi anya umum ndikom emehiweo, b͕akuta kwa Chineke azu n'obi-ha. Otú a ka Job nēme ubọchi nile.
6. Ubọchi we di na umu Chineke biara iguzo onwe-ha n'iru Jehova, Setan we bia kwa n'etiti ha.
7. Jehova we si Setan Òle ebe i si bia? Setan we za Jehova, si, Site n'igaghari n'uwa, na site n'ijeghari nime ya.
8. Jehova we si Setan Ì tukwasiwo obi-gi n'aru orùm, bú Job? na ọ dighi onye di ka ya n'uwa, ọ bu nwoke zuru okè, zi kwa ezi, nke nātu egwu Chineke, nēsi kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya.
9. Setan we za Jehova, si, Ọ̀ bu n'efu ka Job nātu egwu Chineke?