Job 1:17-20 Bible Nso (IGBOB)

17. Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Ndi Kaldea doro usu atọ, made imegide camel, chiri ha, ọzọ kwa, ha were ọnu mma-agha tib͕ue ndi nējere gi ozi; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.

18. Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom nēri ihe nāṅu kwa manya-vine n'ulo nwa-nne-ha, bú ọkpara:

19. ma, le, oké ifufe siri n'ofè ọzara bia, tie nkuku anọ nke ulo ahu, o we dakwasi umu-okorọbia ahu, ha we nwua; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.

20. Job we bilie, dọwa uwe-nwuda-ya; kọpu isi-ya, da n'ala, kpọ isi ala;

Job 1