Jeremaia 8:19-22 Bible Nso (IGBOB)

19. Le, ọ bu olu ntiku nke ada ndim site n'ala di anya nke-uku: Jehova, Ọ̀ nọghi na Zaion? Eze-ya, Ọ̀ nọghi nime ya? Gini mere ha ji were arusi nile ha apiri api, were kwa ihe-efu nile nke onye ala ọzọ, kpasuem iwe?

20. Owuwe-ihe-ubi agabigawo, nghọkọta-nkpuru agwusiwo, ma ayi onwe-ayi, azọputaghi ayi.

21. N'ihi nb͕aji ukwu na aka nke ada ndim ka ab͕ajiworom ukwu na aka: anameyi uwe-nkpe; iju-anya ejidesiwo m ike.

22. Ọ̀ dighi balm di na Gilead? ọ̀ dighi dibia nọ n'ebe ahu? ọ̀ bu kwa gini mere anu-aru ọhu nējighi epuchi n'aru ada ndim?

Jeremaia 8