Jeremaia 52:24-34 Bible Nso (IGBOB)

24. Onye-isi ndi-ob͕ū we chiri Seraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na Zefanaia, bú onye-nchu-àjà nke-abua, na ndi-nche atọ nke nbata-uzọ:

25. o si-kwa-ra n'obodo chiri otù onozi nke emeworo onye-nlekọta ndikom agha; na ndikom asa nime ndi nāhu iru eze, ndi achọtara n'obodo; na ode-akwukwọ, bú onye-isi usu-ndi-agha, onye nēme ka ndi ala ahu zukọta ibu agha; na ọgu ndikom atọ nime ndi ala ahu, ndi achọtaworo n'etiti obodo.

26. Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, we chiri ha, me ka ha jekuru eze Babilon, rue Ribla.

27. Eze Babilon we tib͕ue ha, me ka ha nwua na Ribla, n'ala Hemat. Ewe me ka Juda si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ.

28. Nka bu ndi ahu nke Nebukadreza mere ka ha je biri n'ala ọzọ; n'arọ nke-asa nnù ndi-Ju asa na ọgu iri-na-otù na atọ:

29. n'arọ nke-iri-na-asatọ nke Nebukadreza ka o mere ka nnù madu abua na orú na iri na abua si na Jerusalem je biri n'ala ọzọ:

30. n'arọ nke-orú-na-atọ nke Nebukadreza ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ndi-Ju ufọdu, bú nnù madu na ọgu iri-na-asa na ise, je biri n'ala ọzọ: madu nile di nnù iri na otù na ọgu iri.

31. O rue, n'arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke emere ka Jehoiakin, bú eze Juda, je biri n'ala ọzọ, n'ọnwa nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-orú-na-ise nke ọnwa ahu, na Evil-merodak, bú eze Babilon, n'arọ ọ malitere ibu eze, o weliri isi Jehoiakin, bú eze Juda, me ka o si n'ulo-nkpọrọ puta;

32. o we gwa ya okwu ọma, do oche-eze-ya elu kari oche-eze nke ndi-eze ndi ya na ha nọ na Babilon.

33. O we b͕anwe uwe nkpọrọ ya, o we nēri nri n'iru ya mb͕e nile ubọchi nile nke ndu-ya.

34. Anēnye kwa ya òkè-ihe-oriri-ya, bú òkè-ihe-oriri mb͕e nile, site n'aka eze Babilon, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya rue ubọchi ọnwu-ya, ubọchi nile nke ndu-ya.

Jeremaia 52