16. Ma ufọdu nime ndi ala ahu ndi nēnweghi ike ka Nebuzaradan, onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha fọdu ibu ndi-ọlu-ubi-vine na ibu ndi-ọlu-ubi.
17. Ma ogidi ọla nile nke di n'ulo Jehova, na ihe-ndọkwasi nile na oké osimiri ọla nke di n'ulo Jehova, ndia ka ndi Kaldea tipiara, chiri ọla-ha nile je Babilon.
18. Ite nile kwa, na osekè nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe ọla nile nke ha ji eje ozi, ndia ka ha chipuru.
19. Ọkwa nile kwa, na ihe-igu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ite nile, na ihe-idọba-oriọna nile, na ngaji nile, na iko nile; ihe nke bu ọla-edo, n'ọla-edo, na ihe nke bu ọla-ọcha, n'ọla-ọcha, onye-isi ndi-ob͕ū chipuru ha.
20. Ogidi abua ahu, na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua nke ọla nke di n'okpuru ihe-ndọkwasi-ya nile, nke eze, bú Solomon, mere nye ulo Jehova; ọ dighi ọtùtù atùru ọla ihe ndia nile.
21. Ma ogidi abua ahu, cubit iri na asatọ ka idi-elu otù ogidi di; ogho cubit iri na abua b͕a-kwa-ra ya buruburu; ib͕idi-ya di nkpisi-aka anọ: ọ di oghere n'ime-ya.
22. Isi nke di n'elu ya bu kwa ọla; idi-elu otù isi ahu di cubit ise; ihe-ọkpukpa na pomegranate di kwa n'isi ahu buruburu, ha nile bu ọla: ihe dika ndia ka ogidi nke-abua nwe-kwa-ra, ha na pomegranate.
23. Ma pomegranate ahu di ọgu anọ na iri na isi n'akuku ọ bula; pomegranate nile di ọgu ise n'elu ihe-ọkpukpa buruburu.
24. Onye-isi ndi-ob͕ū we chiri Seraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na Zefanaia, bú onye-nchu-àjà nke-abua, na ndi-nche atọ nke nbata-uzọ:
25. o si-kwa-ra n'obodo chiri otù onozi nke emeworo onye-nlekọta ndikom agha; na ndikom asa nime ndi nāhu iru eze, ndi achọtara n'obodo; na ode-akwukwọ, bú onye-isi usu-ndi-agha, onye nēme ka ndi ala ahu zukọta ibu agha; na ọgu ndikom atọ nime ndi ala ahu, ndi achọtaworo n'etiti obodo.
26. Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, we chiri ha, me ka ha jekuru eze Babilon, rue Ribla.
27. Eze Babilon we tib͕ue ha, me ka ha nwua na Ribla, n'ala Hemat. Ewe me ka Juda si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ.