Jeremaia 51:33-46 Bible Nso (IGBOB)

33. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ada Babilon di ka ebe-nzọcha-ọka mb͕e anāzọcha ya; nwa mb͕e fọduru, mb͕e owuwe-ihe-ubi ewe biarue ya aru.

34. Nebukadreza, bú eze Babilon, eripiawom, o kpochapuwom, o mewom ka m'ghọ aria nke ihe nādighi, o lowom dika ogologo anu-miri, o mejuwo afọ-ya n'ihe-utọm nile, ọ chupuwom.

35. Ihe-ikem na nke anu-arum di n'isi Babilon, ka nwanyi nke bi na Zaion gāsi; ọzọ, Ọbaram di n'isi ndi bi na Kaldea, ka Jerusalem gāsi.

36. N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Le, M'gaje ikpe ọnu-gi, bọ̀ ọ́bọ̀-gi; M'gēme kwa ka oké osimiri-ya tasia, me kwa ka isi-iyi-ya takọrọ.

37. Babilon gāghọ kwa nání obo-ihe obo-ihe, ebe-obibi nkita-ọhia, na ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, ghara inwe onye-obibi.

38. N'otù ka ha gāb͕ọ uja dika umu-ọdum; ha edekpọwo dika umu-ọdum nāṅu ara.

39. N'okpom-ọku-ha ka M'gēme ọṅuṅu-manya nile ha, mee ka ha ṅubiga manya ókè, ka ha we ṅuria ọṅu-agha, raru ura ebighi-ebi, ghara iteta; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

40. M'gēme ka ha rida dika umu-aturu ka ewe b͕ue ha, dika ebulu, ha na nkpi.

41. Le, ka esiworo were Shishak! le, ka esiworo jide otuto uwa nile! le, ka Babilon siworo ghọ ihe-iju-anya n'etiti mba nile!

42. Oké osimiri erukpuwo Babilon: ejiwo nkpọtu nmali-miri-ya nile kpuchie ya.

43. Obodo-ya nile aghọwo ihe-iju-anya, na ala kpọrọ nku, na ala ihe nādighi, bú ala nke ọ nādighi onye ọ bula nēbi nime ha, nwa madu ọ bula adighi-agabiga kwa nime ha.

44. M'gēji kwa nmehie-ya leta Bel nime Babilon, M'gēme kwa ka ihe o loworo si n'ọnu-ya puta; mba di iche iche agaghi-erùkuru kwa ya ọzọ dika miri: ọzọ mb͕idi Babilon gāda.

45. Sinu n'etiti ya pua, unu ndim, wepuganu onwe-unu n'otù n'otù n'iwe di ọku nke Jehova.

46. Lezi-kwa-nu anya ka obi-unu ghara ilọ unu miri, ka unu ghara itu egwu n'ihi akukọ ahu nke anānu n'ala ahu; n'ihi na akukọ ahu gābia n'otù arọ, emesia n'arọ ọzọ akukọ ahu gābia kwa, ihe-ike gādi kwa n'ala ahu, onye nāchi achi nēmegide onye nāchi achi.

Jeremaia 51