19. Ọ bughi dika ihe ndia ka òkè Jekob bu; n'ihi na onye nākpu ihe nile ka Ọ bu; Israel bu kwa ebo nke ihe-nketa-Ya: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.
20. Anyu-ike-agha ka i burum na ihe-agham nile; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia mba di iche iche; ọ bu kwa gi ka M'gēji bibie ala-eze di iche iche;
21. ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia inyinya na onye nānọkwasi ya; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia ub͕ọ-ala na onye nānọkwasi ya;
22. ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia nwoke na nwanyi; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia agadi-nwoke na nwa-okoro; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia nwa-okorọbia na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke;
23. ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia onye-ọzùzù-aturu na ìgwè aturu-ya; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia onye-ọlu-ubi na ehi-ya ejikọrọ abua abua; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze.
24. M'gākwughachi kwa Babilon, kwughachi kwa ndi nile bi na Kaldea, ihe ọjọ nile ha nke ha meworo nime Zaion n'anya-unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
25. Le, Mu nēmegide gi, gi ugwu nēbibi ebibi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), nke nēbibi uwa nile: M'gēseti kwa akam imegide gi, kpọreda gi site na nkume-gi nile di elu, mee ka i ghọ ugwu esurere esure.
26. Ha agaghi-eweputa nime gi otù nkume ido na nkuku-ulo, ma-ọbu otù nkume itọ ntọ-ala; n'ihi na ebe nke tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi ka i gābu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
27. Bulienu ọkọlọtọ n'ala ahu, fùanu opì-ike n'etiti mba nile, donu mba di iche iche nsọ imegide ya, menu ka ala-eze, bú Ararat, na Mini, na Ashkenaz, nuru, zukọ imegide ya: menu ka otù ọchi-agha buru onye-nlekọta imegide ya; menu ka inyinya rigota dika igurube di egwu.
28. Donu mba di iche iche nsọ imegide ya, donu ndi-eze Midia, na ndi nāchi ala-ya, na ndi-ya nile nọchiri anya eze, na ala nile ọ nāchi, nsọ.
29. Ala ahu we nāma jijiji, nāb͕ali kwa: n'ihi na èchìchè nile nke Jehova megide Babilon eguzosiwo ike, ime ka ala Babilon ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.
30. Ndi-dike Babilon arapuwo ibu agha, ha nọduru n'ebe nile ha ewusiri ike; idi-ike-ha alasiwo; ha aghọwo ndinyom: ndi-iro-ha esuyewo ọku n'ebe-obibi-ya nile; etijiwo ihe-ntuchi-ya nile.
31. Otù ọb͕a-ọsọ gāb͕a ọsọ izute ọb͕a-ọsọ-ibe-ya, otù onye-ngosi gāb͕a kwa ọsọ izute onye-ngosi-ibe-ya, igosi eze Babilon na ewerewo obodo-ya na nsọtu-ya:
32. ọ bu kwa ngabiga-miri nile ka ewereworo, ọ bu kwa ọdọ-miri nile ka ha sureworo ọku, ndi-agha amawo kwa jijiji.
33. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ada Babilon di ka ebe-nzọcha-ọka mb͕e anāzọcha ya; nwa mb͕e fọduru, mb͕e owuwe-ihe-ubi ewe biarue ya aru.