1. Otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje ikpọte ifufe nke nēbibi ebibi megide Babilon, na n'ebe ndi bi na Leb-kamai nọ.
2. M'gēziga-kwa-ra Babilon ndi ala ọzọ, ndi gāfucha ya; ha gāwusi kwa ala-ya dika miri; n'ihi na ha nọ nēmegide ya buruburu n'ubọchi ihe ọjọ.
3. Ka okwe-uta kwe uta-ya n'ebe onye nēkwe uta nọ, na n'ebe onye nēweli onwe-ya elu n'uwe-agha-ya nọ: unu enwe-kwa-la ọmiko n'aru umu-okorọbia-ya; wezuganu usu-ndi-agha-ya nile ka ebibie ya.
4. Ha gāda kwa, buru ndi eb͕uru eb͕u, n'ala ndi Kaldea, na ndi adupuru adupú, n'èzí-ya nile.
5. N'ihi na Israel, ma-ọbu Juda, abughi nwanyi nke di-ya, bú Chineke-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwuru anwu; ọ bu ezie na ala-ha juputara n'ikpe-ọmuma megide Onye Nsọ nke Israel.
6. Sinu n'etiti Babilon b͕alaga, wepuga-kwa-nu onwe-unu n'otù n'otù; unu ekwela ka eme unu ka unu dere du n'ajọ omume-ya: n'ihi na mb͕e ibọ̀-ọ́bọ̀ ka ọ buru Jehova; nmeso obodo ahu ka Ya onwe-ya nākwughachi ya.
7. Iko ọla-edo ka Babilon buworo n'aka Jehova, nke nēme ka uwa nile ṅubiga manya ókè: ufọdu nime manya-vine-ya ka mba di iche iche ṅuworo; n'ihi nka ka mba di iche iche nāwi ara.
8. Na mberede ka Babilon daworo, ewe tipia ya: kwasierenu ya ákwá ike; werenu balm bayere ihe-nb͕u-ya ma eleghi anya agāgwọta ya.
9. Ayi gāgwọtawori Babilon, ma agwọtaghi ya: rapunu ya, ka ayi la, onye ọ bula n'ala-ya: n'ihi na ikpé-ya erutuwo elu-igwe, ebuliwo kwa ya rue mbara-ígwé.
10. Jehova emewo ka ezi omume nile ayi puta: bianu, ka ayi kọ akukọ ọlu Jehova, bú Chineke-ayi, nime Zaion.
11. Muchanu àkú nile; jidesienu ọta nile ike: Jehova akpọtewo mọ nke ndi-eze Midia; n'ihi na imegide Babilon ka nzube-Ya di, ibibi ya: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.
12. Bulienu ọkọlọtọ n'ebe mb͕idi nile nke Babilon di, menu ka nche sie ike, menu ka ndi-nche guzosie ike, dozienu uju nēru nbì; n'ihi na Jehova ezubewo me kwa ihe O kwuru megide ndi bi na Babilon.
13. Gi onye bi n'elu ọtutu miri, onye nwere ọtutu àkù, ọgwugwu-gi abiawo, bú ọtùtù nke urù-gi nēzighi ezi.