Jeremaia 50:23-29 Bible Nso (IGBOB)

23. Le ka esiworo bipu otùtù nke uwa nile, b͕aji kwa ya nke-uku! le ka Babilon siworo ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu nke-uku n'etiti mba nile!

24. Esiworom i ọnyà, ọzọ kwa, amawo gi n'ọnyà ahu, gi Babilon, ma gi onwe-gi amagh: achọtawo gi, ọzọ kwa, ejidewo gi, n'ihi na Jehova ka i lusoworo ọ̀gù.

25. Jehova emeghewo ulo-àkù-Ya, chiputa ihe-agha nile nke oké iwe-Ya: n'ihi na ozi di nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēje n'ala ndi Kaldea.

26. Sinu na nsọtu-ya biarue ya, meghenu ọba-ya nile: tulienu ya dika obo-ihe, wezuga-kwa-nu ya ka ebibie ya: ekwela ka ihe fọduru ya.

27. Gbuenu oke-ehi-ya nile; ka ha rida ka ewe b͕ue ha: ahuhu diri ha! n'ihi na ubọchi-ha abiawo, bú mb͕e nleta-ha.

28. Ge nti olu ndi nāb͕alaga, ndi nāb͕apu n'ala Babilon, igosi ibọ̀-ọ́bọ̀ nke Jehova, bú Chineke-ayi, na Zaion, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.

29. Menu ka ndi-ọb͕a-uta nuru izukọ imegide Babilon, bú ndi nile nāzọ uta ukwu ikwe ya; manu ulo-ikwū-unu imegide ya buruburu; ya ghara inwe ndi b͕apuru ab͕apu: kwughachinu ya ugwọ dika ọlu-ya si di; dika ihe nile si di nke o meworo, menu ya otú a: n'ihi na Jehova ka o meworo nganga megide, megide Onye Nsọ nke Israel.

Jeremaia 50