Jeremaia 5:23-31 Bible Nso (IGBOB)

23. Ma ndi nka nwere obi nēwezuga onwe-ya nānupu kwa isi; ha ewezugawo onwe-ha, we la.

24. Ha asighi kwa n'obi-ha, Biko, ka ayi tua egwu Jehova, bú Chineke-ayi, Onye nēnye oké miri-ozuzo, ma nke-mbu ma nke-ikpe-azu, na mb͕e-ya; ízù nile akara àkà nke owuwe-ihe-ubi ka Ọ nēdebere ayi.

25. Ajọ omume nile unu ewezugawo ihe ndia, nmehie nile unu eb͕ochiwo-kwa-ra unu ezi ihe.

26. N'ihi na ahuwo ndi nēmebi iwu n'etiti ndim: ha nēle anya buruburu, dika ndi-osi-ọnyà si eche anwu; ha esiwo ọnyà, ọ bu madu ka ha nānwude.

27. Dika nkata nnunu si ejuputa n'anu-ufe, otú a ka ulo nile ha juputara n'aghughọ: n'ihi nka ka ha ghọworo ndi uku, we buru ọgaranya.

28. Ha amawo abuba, aru-ha eb͕uwo àmùmà: e, emebigawo ihe ọjọ ókè: ha ekpeghi ọnu, bú ọnu nke nwa-nb͕ei, ka o we gara ha nke-ọma; ọ bu kwa ikpe nke ndi-ob͕eye ka ha nādighi-ekpe.

29. M'gaghi-eleta n'ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ kwa mba nke di otú a ọ́bọ̀?

30. Ihe-iju-anya na ihe jọb͕uru onwe-ya emewo n'ala;

31. ndi-amuma ebuwo amuma ugha, ndi-nchu-àjà nāzọda kwa ndim site n'aka-ha; ndim ahuwo kwa ihe di otú a n'anya: ma gini ka unu gēme n'ikpe-azu-ya?

Jeremaia 5