Jeremaia 49:8-12 Bible Nso (IGBOB)

8. B͕alaganu, chigharia, biri n'ebe di omimi, unu ndi bi na Dedan; n'ihi na nhuju-anya Isọ ka M'gēme ka ọ biakwasi ya, mb͕e M'gēleta ya.

9. Ọ buru na ndi nāghọrọ nkpuru-vine abiakute gi, hà agaghi-aghọfọ nkpuru nke fọduru itutukọ? ọ buru na ndi-ori abia n'abali, hà agaghi-ebibi nke gēzuru ha?

10. N'ihi na Mu onwem ab͕abawo Isọ ọtọ, ekpughepuwom ebe-nzuzo-ya nile, ọ pughi kwa izobe onwe-ya: apunariwo nkpuru-ya na umu-nne-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya ihe-ha, ọ dighi kwa ndu.

11. Rapu umu-nb͕ei-gi, Mu onwem gēdebe ha ndu; ka ndinyom-i di-ha nwuru tukwasim obi-ha.

12. N'ihi na otú a ka Jehova siri: Le, ndi anēkpeghi ikpe iṅu n'iko ahu aghaghi iṅu; ma gi onwe-gi, ì gābu kwa onye ahu nke anāmaghi ikpe ma-ọli? I gaghi-abu onye anāmaghi ikpe, n'ihi na i ghaghi iṅu.

Jeremaia 49