Jeremaia 48:32-35 Bible Nso (IGBOB)

32. Ákwá nke kariri ákwá Jeza ka m'gākwara gi, gi osisi vine nke Sibma: alaka-gi nile gabigara oké osimiri, ọbuná n'oké osimiri nke Jeza ka ha ruru: n'elu nghọkọta-nkpuru-gi na n'elu nghọrọ-nkpuru-vine-gi ka onye nke nāpunara madu ihe daworo.

33. Ewepuwo kwa ọṅù na iteghari-egwú-ọṅù n'ubi ọma na n'ala Moab; emewokwam ka manya-vine kwusi n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile: ọ dighi onye gēji iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine zọcha nkpuru-vine; iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine agaghi-abu iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine.

34. Site n'iti-nkpu Heshbon rue Eleale, rue Jehez ka ha mere ka olu-ha da, site na Zoa rue Horonaim, rue Eglat-shelishiya: n'ihi na ọbuná miri Nimrim gāghọ nání ebe tọb͕ọrọ n'efu.

35. M'gēme kwa ka ọ kwusiri Moab, bú onye nēsure àjà-nsure-ọku n'ebe di elu, na onye nēsurere chi di iche ya ihe-nsure-ọku nesì ísì utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Jeremaia 48