Jeremaia 45 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, gwara Beruk nwa Neraia, mb͕e o dere okwu ndia n'akwukwọ site n'ọnu Jeremaia, n'arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si,

2. Okwu di otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere gi, Beruk, si:

3. I siri, Biko, ahuhu nādirim! n'ihi na Jehova atukwasiwo ihe-nwuta n'elu ihe-nb͕um; adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ize-umem, ma achọtaghm izu-ike.

4. Otú a ka i gāsi ya, Otú a ka Jehova siri: Le, ihe nke M'wuworo ka Mu onwem nākwada, ọzọ, ihe nke M'kuworo n'ubi ka Mu onwem nēropu; ọbuná ala nka nile, nkem ka ọ bu.