Jeremaia 44:14-23 Bible Nso (IGBOB)

14. ọ gaghi-adi kwa onye-nb͕apu ma-ọbu onye fọduru afọdu ndi Juda fọduru gēnwe, bú ndi bataworo n'ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, ọbuná ilaghachi n'ala Juda, nke ha onwe-ha nāchọ si-ike ilaghachi ibi n'ebe ahu: n'ihi na ọ dighi onye gālaghachi ma-ọbughi ndi b͕apuru ab͕apu.

15. Ndikom ahu nile ndi mara na ndinyom-ha nēsurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na ndinyom nile ndi nēguzo n'ebe ahu, ọ bu nkpọkọta di uku, ọbuná ndi Israel nile ndi bi n'ala Ijipt, nime Patros, ha we za Jeremaia, si,

16. Okwu ahu nke i gwaworo ayi n'aha Jehova, ayi agaghi-adi nēge gi nti.

17. Kama ayi aghaghi ime okwu nile ọ bula nke puworo n'ọnu-ayi, isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu, dika ayi meworo, ayi onwe-ayi, na nna-ayi-ha, na ndi-eze-ayi, na ndi-isi-ayi, n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem: ayi we rijue nri afọ, aru adi ayi nma, ọ dighi kwa ihe ọjọ ayi huru.

18. Ma site na mb͕e ayi rapuru isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu, ihe nile akọwọ ayi, ọ bu kwa site na mma-agha na site n'oké unwu ka emeworo ka ayi gwusia.

19. Ma mb͕e ayi onwe-ayi nēsurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nāwusi-kwa-ra ya àjà-ihe-ọṅuṅu, ọ̀ bu mb͕e di-ayi nēkweghi ka ayi meworo ob͕e achicha nye ya ime onyinyo-ya, wusi-kwa-ra ya àjà-ihe-ọṅuṅu?

20. Jeremaia we gwa ndi Israel nile, ma ndikom ma ndinyom, ọbuná ndi Israel nile ndi nāza ya okwu, si,

21. Ọ̀ bughi ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ nke unu surere n'obodo nile nke Juda na n'èzí nile nke Jerusalem, unu onwe-unu, na nna-unu-hà, na ndi-eze-unu, na ndi-isi-unu, na ndi ala ahu, ọ̀ bughi ihe ndia ka Jehova chetara, ihe ahu we bata n'obi-Ya?

22. Jehova apughi kwa inagide kwa ọzọ, n'ihi ihe ọjọ nke omume nile unu, n'ihi ihe-árú nile nke unu meworo; ala-unu we ghọ nkpọnkpọ ebe, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, ghara inwe onye-obibi, dika o si di ta.

23. N'ihi na unu esurewo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na n'ihi na unu emehiewo megide Jehova, we ghara ige nti olu Jehova, ghara kwa ijeghari n'iwu-Ya, na n'ukpuru-Ya nile, na n'ihe-àmà-Ya nile; n'ihi nka ka ihe ọjọ a dakwasiworo unu, dika o si di ta.

Jeremaia 44