Jeremaia 43:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e Jeremaia gwabìri ndi Israel nile okwu nile nke Jehova, bú Chineke-ha, nke Jehova, bú Chineke-ha, zigara ya ka o were ha jekuru ha, bú okwu ndia nile,

2. Azaraia nwa Hoshaia, na Johanan nwa Karea, na ndi-nganga nile, we kwue, si Jeremaia, Okwu-ugha ka gi onwe-gi nēkwu: Jehova, bú Chineke-ayi, eziteghi gi isi, Unu abàla n'Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu:

3. kama Beruk nwa Neraia nākpali gi imegide ayi, ka o we nye ayi n'aka ndi Kaldea, ka ha we me ka ayi nwua, me kwa ka ayi je biri na Babilon.

Jeremaia 43