Jeremaia 41:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, n'ọnwa nke-asa, na Ishmael nwa Netanaia, nwa Elishama, onye sitere na nkpuru ndi nwe ala-eze, onye bu kwa otù nime ndi-isi nke eze, ya na-ndikom iri, biakutere Gedalaia nwa Ahaikam rue Mizpa; ha we rikọ nri n'ebe ahu na Mizpa.

2. Ishmael nwa Netanaia we bilie, ya na ndikom iri ahu ndi ya na ha yikọrọ bia, ha we were mma-agha tib͕ue Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, we me ka ọ nwua, bú onye eze Babilon mere onye-nlekọta ala ahu.

3. Ọ bu kwa ndi-Ju nile ndi ha na ya, bú Gedalaia, nọ, nime Mizpa, na ndi Kaldea ndi ahuru n'ebe ahu, bú ndi-agha, ka Ishmael tib͕uru.

4. O rue, n'ubọchi nke-abua mb͕e emesiri ka Gedalaia nwua, ma ọ dighi onye ọ bula mara ya,

5. na madu ufọdu siri na Shekem, si kwa na Shailo, si kwa na Sameria, bia, bú ọgu ndikom anọ, ndi akọpusiri afu-ọnu-ha, ndi uwe nile ha dọwara adọwa, ndi nēbì kwa onwe-ha mma, jide onyinye-inata-iru-ọma na frankincense n'aka-ha, iwebata ya n'ulo Jehova.

6. Ishmael nwa Netanaia we si na Mizpa pua izute ha, nēje ije nākwa ákwá: o rue, mb͕e o zutere ha, na ọ siri ha Biakutenu Gedalaia nwa Ahaikam.

7. O rue, mb͕e ha batara n'etiti obodo, na Ishmael nwa Netanaia b͕uru ha, tubà ha n'etiti olùlù, ya onwe-ya na ndikom ndi ya na ha nọ.

8. Ma achọtara ndikom iri n'etiti ha ndi siri Ishmael, Emela ka ayi nwua: n'ihi na ayi nwere àkù zoro ezo n'ọhia, bú ọka wheat, na ọka barley, na manu, na manu-aṅu. O we rapu, ghara ime ka ha nwua n'etiti umu-nne-ha.

Jeremaia 41