Jeremaia 40:2-5 Bible Nso (IGBOB)

2. Onye-isi ndi-ob͕ū we were Jeremaia, si ya, Jehova, bú Chineke-gi, kwuru ihe ọjọ a megide ebe a:

3. Jehova we me ka ọ bia, O we me dika O kwuru; n'ihi na unu emehiewo megide Jehova, ma unu egeghi nti olu-Ya, n'ihi nka ka ihe a ruworo unu aru.

4. Ma ub͕u a, le, atọpuwom i ta na nkpọrọ nke di n'aka-gi. Ọ buru na ọ di nma a'anya-gi isorom bia na Babilon, bia, anyam gādi kwa a'aru gi; ma ọ buru na ọ jọrọ njọ n'anya-gi isorom bia na Babilon, ghara: le, ala nka nile di n'iru gi; n'ebe di nma na n'ebe ziri ezi n'anya-gi ije, je n'ebe ahu.

5. Ma mb͕e ọ kālaghachighi, ọ si ya, Ma-ọbu laghachikuru Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, onye eze Babilon meworo onye-nlekọta obodo nile nke Juda, gi na ya biri n'etiti ndi-gi: ma-ọbu je ebe ọ bula ziri ezi n'anya-gi ije. Onye-isi ndi-ob͕ū we nye ya òkè ihe-oriri na onyinye, zilaga ya.

Jeremaia 40